Micah 2

Nzube mmadụ na nzube Chineke

1Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha,
na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche.
Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara,
nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.
2Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike,
na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike.
Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha,
ha na-ezunara ha ihe nketa ha.
3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị,

“Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a,
nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu.
Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa,
nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.
4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu,
ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị,
‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi,
e kesaala ihe nnweta nke ndị m,
ọ napụla m ha.
O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ”

5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,
onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.

Ndị amụma ụgha

6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.”
“Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a,
ihere agaghị eme anyị.”
7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb?
“Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla?
Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?”

“Ọ bụ na okwu m adịghị eme
onye ụzọ ya ziri ezi mma?
8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m
dịka ndị iro.
Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe
uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta,
dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.
9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m
site nʼụlọ afọ ojuju ha.
Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m
ruo mgbe ebighị ebi.
10Bilienụ, pụọnụ,
nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike,
nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya,
o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.
11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,
‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’
ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.

Nkwa nzọpụta

12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,
aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe.
Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ,
dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya,
ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.
13Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha.
Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee.
Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha,
Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”
Copyright information for IboBIU